Proverbs 26

1Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ
dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi.
2Dịka nnụnụ nta na-efegharị efegharị, maọbụ dịka eleke na-awụgharị
otu a ka ọbụbụ ọnụ na-ekwesighị agaghị ere.
3Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ;
otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.
4A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị,
ma ọ bụghị ya gị onwe gị ga-adị ka ya.
5Zaa onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị,
ma ọ bụghị ya ọ ga-abụ onye maara ihe nʼanya onwe ya.
6Iziga ozi site nʼaka onye nzuzu
dịka mmadụ ibipụ ụkwụ ya maọbụ ịṅụ ihe ike dịka mmiri.
7Dịka onye ngwụrọ si eji ụkwụ ya eje ije,
otu a ka ilu si esite nʼọnụ onye nzuzu apụta.
8Ọ baghị uru inye onye nzuzu nsọpụrụ, nʼihi na ọ gaghị anọgide.
Ọ dị ka ịwụ ọkụkọ mmiri nʼazụ.
9Dịka ogwu manyere nʼaka onye na-aṅụbiga mmanya oke
otu a ka ilu dị nʼọnụ onye nzuzu.
10Dịka ọgba ụta si agba ụta ya na-enweghị onye o bụ nʼobi,
otu a ka ọ dị bụ onye na-enye onye nzuzu maọbụ onye o bụla na-agafe nʼụzọ ọrụ ka o rụọra ya.
11Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ,
otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha.
12Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya?
Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a.

13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ,
ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!”
14Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya,
otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.
15Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri
Maọbụ, ọkụ nri

ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya.
16Nʼuche ya, onye umengwụ
Ya bụ, onye nzuzu
na-eche na ọ maara ihe
karịa ndị ikom asaa na-eji ezi uche azaghachi okwu.

17Onye na-etinye onwe ya nʼesemokwu na-agbasaghị ya
dị ka mmadụ na-apụ nʼokporoụzọ dọkpụrụ nkịta ọbụla ọ hụrụ na ntị.

18Dịka onye ara na-agba àkụ
na-ere ọkụ nke na-eweta ọnwụ,
19ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi ya
ma sị, “ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu.”

20Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ,
otu a kwa esemokwu na-akwụsị mgbe a kwụsịrị ikwu ndị ọzọ okwu nʼazụ.
21Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ,
otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ.
22Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ,
ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.

23Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie,
ka egbugbere ọnụ dị nro nke obi jupụtara nʼihe ọjọọ bụ.
24Ndị iro na-eji egbugbere ọnụ ha gbanwee onwe ha,
ma nʼime obi ha ọ bụ naanị aghụghọ dị ya.
25Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha,
nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha.
26Ọ bụ ezie na ọ ga na-eme ka ọ hụrụ gị nʼanya,
ma iro ya ga-apụta ihe, mmadụ niile ga-ahụkwa ya.
27Onye na-egwuru ibe ya olulu ga-adaba nʼime ya.
Ọzọ, onye na-enuda nkume, ya ka nkume ahụ ga-adagbu.
28Onye ị kpọrọ asị bụ onye ị ga-achọ iwetara ihe mgbu site nʼịgha ụgha.
Okwu ọma na-esighị nʼobi mmadụ pụta na-eweta ịla nʼiyi.
Copyright information for IboBIU